Abụ Ọma
Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ.
2 M ga-eji ezi uche mee ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ.+
Olee mgbe ị ga-abịakwute m?+
M ga-ejegharị n’iguzosi ike n’ezi ihe nke obi m n’ime ụlọ m.+
3 Agaghị m edebe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m.+
Akpọrọ m ihe ndị dapụrụ adapụ na-eme asị;+
Ọ dịghị ihe jikọrọ mụ na ya.+
5 Onye ọ bụla nke na-ekwutọ ibe ya na nzuzo,+
M ga-emechi ya ọnụ.+
Onye ọ bụla anya ya dị mpako, onye obi ya dịkwa nganga,+
Agaghị m edili ihe ọ na-eme.+
6 Anya m dị n’ebe ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ụwa nọ,+
Ka ha wee binyere m.+
Onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ,+
Ọ bụ ya ga na-ejere m ozi.+