14 Ha wee na-eme ka ndụ na-elu ha ilu site n’ime ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ n’ịkpụ ájá ụrọ+ na brik, nakwa ịrụgbu onwe ha n’ọrụ n’ụdị ọrụ ọ bụla a na-arụ n’ubi,+ ee, n’ụdị ọrụ ọ bụla ha ji ọchịchị aka ike mee ka ha na-arụrụ ha dị ka ndị ohu.+
7 Jehova kwukwara, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.+