-
Ọpụpụ 27:16Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
16 “N’ọnụ ụzọ ogige ahụ, a ga-enwe ákwà ngebichi dị kubit iri abụọ n’ogologo, nke a ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa kwee,+ nke onye na-ekwe ákwà ga-ekwe, ogidi ha ga-adị anọ, ntọala ha ndị nwere oghere adịrịkwa anọ.+
-
-
Ọpụpụ 38:18Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
18 Ọ bụ onye na-ekwe ákwà kwere ákwà mgbochi nke ọnụ ụzọ ogige ahụ, nke e ji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa kwee,+ ọ dị kubit iri abụọ n’ogologo, ọ dịkwa kubit ise n’ịdị elu malite n’isi ruo ná ngwụsị, dị ka ákwà ngebichi ogige ahụ.+
-