8 ọ naghị agbazinye mmadụ ego ma nara ọmụrụ nwa,+ ọ naghịkwa anara ụma;+ ọ na-esepụ aka ya n’ikpe na-ezighị ezi;+ ọ na-ekpe ikpe ziri ezi n’etiti mmadụ na ibe ya;+
8 Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma.+ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi+ na ịhụ obiọma+ n’anya nakwa iji obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije?+