26 Unu onwe unu ga-edebe ụkpụrụ m na mkpebi ikpe m,+ unu emekwala nke ọ bụla n’ihe arụ ndị a niile, ma ọ bụ nwa afọ ma ọ bụ mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu.+
30 Lezie anya ka a ghara ịmata gị n’ọnyà iso ha,+ mgbe a lasịrị ha n’iyi n’ihu gị, ka ị gharakwa ịjụ ase banyere chi ha, sị, ‘Olee otú mba ndị a si efe chi ha? Ee, mụ onwe m ga-emekwa otu ihe ahụ.’