7 Jehova wee pụta ìhè n’ihu Ebram wee sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị+ ka m ga-enye ala a.”+ E mesịa, o wuuru Jehova, bụ́ onye pụtara ìhè n’ihu ya, ebe ịchụàjà n’ebe ahụ.
18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ,+ o wee sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo n’osimiri ukwu, bụ́ osimiri Yufretis:+
3 Biri dị ka ọbịa n’ala a,+ m ga-anọnyere gị, m ga-agọzikwa gị, n’ihi na ọ bụ gị na mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a niile,+ m ga-emezukwa iyi m ṅụụrụ Ebreham nna gị,+