22 Iwe Chineke wee dị ọkụ maka na ọ gawara; mmụọ ozi Jehova wee guzo n’ụzọ iguzogide ya.+ Ọ nọ n’elu nne ịnyịnya ibu ya na-aga, mmadụ abụọ na-ejere ya ozi sokwa ya.
3 Di ya wee bilie chọrọ ya gaa ka ọ gwa ya okwu ga-emeda ya obi ka o wee kpọghachite ya; ya na onye na-ejere ya ozi sokwa,+ ha jikwa ịnyịnya ibu abụọ. Nwaanyị ahụ wee kpọbata ya n’ụlọ nna ya. Ozugbo nna nwa agbọghọ ahụ hụrụ ya, ọ ṅụrịrị ọṅụ.