25 Jehova ga-eme ka e merie gị n’ihu ndị iro gị.+ Otu ụzọ ka ị ga-esi gaa ibuso ha agha, ma ị ga-esi n’ụzọ asaa gbaa ọsọ n’ihu ha; ị ga-aghọkwa ihe ga-eme ka alaeze niile nke ụwa tụọ ụjọ.+
6 Ndị Izrel wee hụ na ha nọ n’oké ihe isi ike,+ n’ihi na ihe taara ha akpụ; ha wee na-ezo onwe ha n’ọgba+ nakwa n’oghere dị na nkume nakwa na nkume ndị dị elu nakwa n’oghere ndị dị n’okpuru ala nakwa n’olulu mmiri.