8 “‘N’oge na-adịghị anya, m ga-awụkwasị gị ọnụma m,+ m ga-ewesa gị iwe m dum,+ m ga-ekpekwa gị ikpe dị ka ụzọ gị niile si dị+ ma mee ka ihe arụ gị niile bịakwasị gị.
30 “‘Ya mere, ọ bụ dị ka ụzọ onye ọ bụla si dị ka m ga-ekpe unu ikpe,+ ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Chigharịanụ, ee, hapụnụ mmebi iwu unu niile,+ ka ihe ọ bụla gharakwa ịbụrụ unu ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpata njehie.+