40 Ma Pita mere ka mmadụ niile pụọ n’èzí.+ O gburu ikpere n’ala, kpee ekpere. Mgbe ọ tụgharịrị chee ihu n’ebe ozu ahụ dọ, ọ sịrị: “Tabita, bilie!” O meghere anya ya, ozugbo ọ hụkwara Pita, o biliri nọrọ ọdụ.+
16 Ya mere, na-ekwupụtanụ+ mmehie unu gwa ibe unu, na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere, ka e wee gwọọ unu.+ Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.+