4 na ihe oriri na-adị na tebụl ya+ na otú ndị na-ejere ya ozi si anọdụ ala na otú ndị na-ejere ya ozi n’oge nri si eje ozi na ejiji ha+ na otú ndị na-ebunye ya ihe ọṅụṅụ si ejere ya ozi+ nakwa otú ha si eji ejiji, na àjà nsure ọkụ+ ọ na-achụ mgbe niile n’ụlọ Jehova,+ o riri ya ọnụ.