19 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ị nwaa anwa chefuo Jehova bụ́ Chineke gị, i wee soro chi ọzọ ma fee ha ofufe, kpọọkwara ha isiala, ana m agbara unu àmà taa na unu ga-alarịrị n’iyi.+
46 ọ gara n’ihu ịsị ha: “Tinyenụ okwu niile m na-agwa unu iji dọọ unu aka ná ntị taa n’obi unu,+ ka unu wee nye ụmụ unu iwu ka ha lezie anya ime ihe niile e kwuru n’iwu a.+