11 Lee, Amaraya onyeisi nchụàjà bụ onyeisi unu n’okwu niile metụtara Jehova;+ tinyere Zebadaya nwa Ishmel bụ́ onye ndú nke ụlọ Juda n’okwu niile metụtara eze; unu nwekwara ndị Livaị bụ́ ndị unu ga-eji mere ndị nlekọta. Dịnụ ike+ ma meenụ ihe, ka Jehova+ gọziekwa ihe ọma unu na-eme.”+