41 Mba ndị a wee na-atụ egwu Jehova,+ ma, ọ bụ ihe oyiyi ha a pịrị apị ka ha na-efe ofufe. Ruo taa, ma ụmụ ha ma ụmụ ụmụ ha na-eme nnọọ dị ka ndị nna nna ha mere.
17 Ma ọ na-eji nke fọrọ afọ pịa chi, bụ́ ihe oyiyi ọ pịrị apị. Ọ na-adara ya n’ala, kpọọrọ ya isiala, kpekuo ya ekpere, sị: “Napụta m, n’ihi na ị bụ chi m.”+