10 O wee wuo ụlọ nche+ n’ala ịkpa, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri (n’ihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ), o mekwara otú ahụ na Shefila+ nakwa n’ala dị larịị. O nwere ndị ọrụ ubi na ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn n’ugwu nakwa na Kamel, n’ihi na o nwere mmasị n’ọrụ ubi.