25 Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu unu.+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ụjọ unu na egwu unu jide ndị bi n’ala+ dum unu ga-azọ ụkwụ na ya, dị nnọọ ka o kwere unu ná nkwa.
17 N’ógbè niile dị iche iche na obodo niile dị iche iche ebe okwu eze na iwu ya ruru, ndị Juu nwere ọṅụ na obi ụtọ, ọ bụkwa ụbọchị oriri+ na ikpori ndụ; ọtụtụ n’ime ndị obodo+ ahụ na-ekwukwa na ha bụ ndị Juu,+ n’ihi na ụjọ+ ndị Juu jidere ha.