16 O wee ruo n’ụbọchị nke atọ, mgbe chi bọrọ, na égbè eluigwe malitere ịgba, àmụ̀mà malitekwara igbu,+ ígwé ojii kpuchikwara elu ugwu ahụ,+ opi dasikwara ụda ike,+ nke mere na ụmụ Izrel niile ndị nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu malitere ịma jijiji.+
11 Ma ọ sịrị: “Pụọ, guzokwa n’ugwu a n’ihu Jehova.”+ Ma, lee! Jehova na-agafe,+ oké ifufe dị ike wee na-agbawa ugwu, na-agbawakwa nkume dị elu n’ihu Jehova.+ (Jehova anọghị n’ifufe ahụ.) Mgbe ifufe ahụ kwụsịrị, e nwere ala ọma jijiji.+ (Jehova anọghị n’ala ọma jijiji ahụ.)