Ilu 13:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+ Ilu 19:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Nye nwa gị ntaramahụhụ mgbe olileanya ka dị;+ ekwekwala ka igbu ya gụọ mkpụrụ obi gị agụụ.+ Ilu 29:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+ Ilu 29:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Nye nwa gị ntaramahụhụ, ọ ga-eme ka i zuru ike, meekwa ka mkpụrụ obi gị ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu.+ Ndị Efesọs 6:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe,+ kama na-azụlitenụ ha+ n’ọzụzụ+ na nduzi echiche+ nke si n’aka Jehova.
24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+
15 Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+
4 Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe,+ kama na-azụlitenụ ha+ n’ọzụzụ+ na nduzi echiche+ nke si n’aka Jehova.