7 Lee ka o si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ+ nke onye na-eweta ozi ọma,+ bụ́ onye na-ekwusa udo,+ onye na-eweta ozi ọma nke ihe ka mma,+ onye na-ekwusa nzọpụta,+ onye na-asị Zayọn: “Chineke gị aghọọla eze!”+
15 Oleekwa otú ha ga-esi kwusaa ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?+ Dị nnọọ ka e dere, sị: “Lee ka ụkwụ nke ndị na-ezisa ozi ọma nke ihe dị mma si maa mma nke ukwuu!”+