19 ka ị gharakwa ileli anya n’eluigwe ma hụ anyanwụ na ọnwa na kpakpando, bụ́ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, e wee rafuo gị, i wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha,+ bụ́ ihe Jehova bụ́ Chineke gị kenyere ndị niile nọ n’okpuru eluigwe dum.+
3 o wee gaa fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala, ma ọ bụ kpọọrọ anyanwụ ma ọ bụ ọnwa ma ọ bụ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe isiala,+ bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu,+
19 “Mgbe anyị na-esurere ‘eze nwaanyị nke eluigwe’+ ihe nsure ọkụ ma na-awụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ,+ ọ̀ bụ na anyị adịghị agwa ndị di anyị mgbe anyị na-eme achịcha e ji achụrụ ya àjà, bụ́ ndị anyị na-akpụ n’oyiyi ya, nakwa mgbe anyị na-awụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ?”+