27 O wee sị ha: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Ka onye ọ bụla n’ime unu kee mma agha ya n’apata ụkwụ ya. Gagharịanụ site n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ n’ebe unu mara ụlọikwuu, ka onye ọ bụla n’ime unu gbuo nwanne ya na enyi ya na onye ya na ya dị ná mma.’”+