43 Ka nke a na-eme, ha agaghị ebi n’ala ha, ala ha ga-anọkwa na-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji,+ mgbe ọ ga-atọgbọ nkịtị n’enweghị onye ọ bụla n’ime ha bi na ya, ha onwe ha anọrọkwa na-akwụ ụgwọ njehie ha,+ n’ihi na ha jụrụ mkpebi ikpe m,+ mkpụrụ obi ha kpọkwara ụkpụrụ m asị.+