22 M ga-akwatukwa ocheeze nke alaeze dị iche iche, mee ka ike alaeze nke mba+ dị iche iche laa n’iyi; m ga-akwatukwa ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ha, ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-anwụkwa, onye ọ bụla site ná mma agha nwanne ya.’”+
8 “N’ihi na mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha,+ a ga-enwe ala ọma jijiji+ n’ebe dị iche iche, a ga-enwe ụkọ nri.+ Ihe ndị a bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.+
4 Ịnyịnya ọzọ wee pụta, bụ́ ịnyịnya na-acha uhie uhie; e nyere onye nọ n’elu ya ikike iwepụ udo n’ụwa ka ha wee gburịta ibe ha; e nyekwara ya oké mma agha.+