24 E mesịa, eze Asiria si na Babịlọn+ na Kuta na Ava+ na Hemat+ na Sefaveyim+ kpọta ndị mmadụ, meekwa ka ha bichie ụmụ Izrel n’obodo ndị dị na Sameria;+ ha wee malite iweghara Sameria, birikwa n’obodo ya dị iche iche.
9 Ya mere, nwaanyị Sameria ahụ sịrị ya: “N’agbanyeghị na ị bụ onye Juu, olee otú i si na-arịọ m ka m nye gị mmiri ka ị ṅụọ, ebe m bụ nwaanyị Sameria?” (N’ihi na ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe.)+