24 Akụkọ banyere ya gazuru Siria dum;+ ha wee kpọtara ya ndị niile ahụ́ na-adịghị mma,+ ndị ọrịa na mmekpa ahụ́ dị iche iche na-esogbu, ndị mmụọ ọjọọ ji na ndị akwụkwụ+ na ndị ahụ́ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, o wee gwọọ ha.
40 Ma mgbe anyanwụ na-ada, ndị niile nwere ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute ya. Ọ na-ebikwasị onye nke ọ bụla n’ime ha aka n’isi wee gwọọ ya.+