21 Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, Jizọs Kraịst bidoro igosi ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-aga Jeruselem wee taa ọtụtụ ahụhụ n’aka ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, a ga-egbukwa ya. N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.+
32 Ugbu a, ha na-aga n’okporo ụzọ ka ha gbagoo Jeruselem, Jizọs nọkwa ha n’ihu, o wee ju ha anya; ma ndị so ha malitere ịtụ egwu. Ọ kpọpụkwara mmadụ iri na abụọ ahụ n’akụkụ wee malite ịkọrọ ha ihe ndị a a kara aka ga-adakwasị ya:+