3 Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya,+ ọ bụ onye nwere ihe mgbu, onye makwaara ihe bụ́ ọrịa.+ Ọ bụkwa onye anyị wepụrụ ihu anyị n’ebe ọ nọ.+ E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ.+
22 kama ọ sịrị ha: “Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbukwa ya.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+