3 Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ma mee ka ọ dị nsọ, n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Chineke nọworo na-ezu ike n’ọrụ ya dum nke ike ihe bụ́ nke ọ rụrụ dị ka o zubere.+
10 Ọ̀ bụ na i kweghị na mụ na Nna m dị n’otu, na Nna m na mụ onwe m dịkwa n’otu?+ Adịghị m ekwu ihe m na-agwa unu n’echiche nke onwe m; kama ọ bụ Nna m nke mụ na ya dị n’otu na-arụ ọrụ ya.+