23 Gị onwe gị kwa, Kapaniọm,+ à ga-ebuli gị elu ruo n’eluigwe? Ị ga-agbadaru+ Hedis;+ n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ na Sọdọm ka a rụrụ ọrụ dị ike ndị a rụrụ n’ime gị, ọ gaara adịgide ruo taa.
31 Ma ọtụtụ ndị n’ime ìgwè mmadụ ahụ nwere okwukwe n’ebe ọ nọ;+ ha malitekwara ịsị: “Mgbe Kraịst bịara, ọ̀ ga-eme ihe ịrịba ama+ karịa nke nwoke a na-eme?”
47 N’ihi ya, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii mere ka Sanhedrin+ zukọta, wee malite ịsị: “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama?+