28 Chineke gọzikwara ha,+ Chineke wee sị ha: “Mụọnụ ọmụmụ,+ baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu,+ ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”+