21 Erọn ga-ebikwasị aka ya abụọ+ n’isi mkpi ahụ dị ndụ wee kwupụta+ njehie niile+ nke ụmụ Izrel na nnupụisi niile ha na mmehie niile ha+ n’isi ya, ọ ga-eme ka ha dịrị n’isi mkpi ahụ+ ma mee ka nwoke nọ na-echere+ kpụrụ ya kpụga n’ala ịkpa.+
28 otú a kwa ka a chụrụ Kraịst n’àjà naanị otu ugboro+ ka o buru mmehie nke ọtụtụ ndị;+ mgbe ndị na-achọsi ya ike maka nzọpụta ha ga-ahụkwa+ ya nke ugboro abụọ,+ ọ gaghị abụ n’ihi mmehie,+ ndị na-achọsi ya ike maka nzọpụta ha ga-ahụkwa ya.+