25 Onye ọ bụla nke sokwa n’asọmpi na-enwe njide onwe onye+ n’ihe niile. Otú ọ dị, ha na-eme ya ka ha wee nweta okpu mmeri pụrụ ire ure,+ ma anyị na-eme ya ka anyị wee nweta nke na-apụghị ire ure.+
12 Obi ụtọ na-adịrị onye na-atachi obi n’ọnwụnwa,+ n’ihi na mgbe a nwapụtara ya, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ,+ nke Jehova kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.+