Job 4:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Lee! Ị gbaziwo ọtụtụ ndị,+Ị na-emebukwa ka aka ndị na-adịghị ike dị ike.+ Aịzaya 40:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike;+ ọ na-emekwa ka onye na-enweghị ike+ nwee ume nke ukwuu. Luk 22:32 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 32 Ma arịọsiwo m arịrịọ ike+ maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.”+
32 Ma arịọsiwo m arịrịọ ike+ maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.”+