Ilu 21:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+ Aịzaya 3:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ahụhụ ga-adịrị onye ajọ omume!—Ka ọdachi dakwasị ya; n’ihi na ihe o mere ndị ọzọ ka a ga-eme ya!+ Matiu 5:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere,+ n’ihi na a ga-emere ha ebere. Matiu 6:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.+ Luk 6:36 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 36 Na-emenụ ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.+
13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+
15 ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.+