5 O wee mụọ ọkpara,+ bụ́ nwa nwoke, onye ga-eji mkpanaka ígwè+ zụọ mba niile dị ka atụrụ. E kukwaara nwa ya gaa n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe ocheeze ya dị.+
15 Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta,+ ka o jiri ya gbuo mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ.+ Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe nzọchapụta mmanya+ nke iwe nke ọnụma Chineke,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.