16 O wee ruo n’ụbọchị nke atọ, mgbe chi bọrọ, na égbè eluigwe malitere ịgba, àmụ̀mà malitekwara igbu,+ ígwé ojii kpuchikwara elu ugwu ahụ,+ opi dasikwara ụda ike,+ nke mere na ụmụ Izrel niile ndị nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu malitere ịma jijiji.+
18 Mmadụ niile nọ na-anụ ụda égbè eluigwe na ụda opi ahụ, na-ahụkwa àmụ̀mà na-egbunụ nakwa ka ugwu ahụ na-akwụ anwụrụ. Mgbe ha hụrụ ya, ha mara jijiji ma guzoro n’ebe dịtụ anya.+