40 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-aghọrọ mkpụrụ nke osisi ndị mara mma, gburukwa igu nkwụ+ na alaka nke osisi ndị wara alaka na osisi pọpla nke ndagwurugwu, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ruo ụbọchị asaa.
13 ha chịịrị igu nkwụ+ gaa izute ya. Ha wee malite iti mkpu,+ sị: “Biko, zọpụta ya!+ Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ,+ bụ́ eze+ Izrel!”