33 Ọ bụrụ na Fero akpọọ unu ma jụọ unu, sị, ‘Gịnị ka unu na-arụ?’ 34 unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị na-akpa anụ malite n’oge anyị bụ ụmụaka ruo ugbu a, ma anyịnwa ma nna nna anyị hà.’+ Ọ ga-ahapụzi unu ka unu biri na Goshen,+ n’ihi na ndị Ijipt kpọrọ onye ọ bụla na-azụ atụrụ asị.”+