16 Seraị, nwunye Ebram, amụtaraghị ya nwa.+ Ma o nwere nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi aha ya bụ Hega.+ 2 Seraị sịrị Ebram: “Lee, Jehova egbochiela m ịmụ nwa. Biko, gị na nwaanyị na-ejere m ozi nwee mmekọahụ. Ma eleghị anya, ọ ga-amụtara m ụmụ.”+ Ebram wee kweta ime ihe Seraị kwuru.