8 Jehova Chineke kụkwara ubi n’Iden,+ n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka o mere ka mmadụ ahụ o kere biri.+ 9 Jehova Chineke wee mee ka osisi ọ bụla nke dị mma ile anya, nke mkpụrụ ya dịkwa mma oriri, puo n’ala. O mekwara ka osisi nke ndụ+ na osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ+ puo n’etiti ubi ahụ.