7 Ma, ọ napụtara Lọt, onye ezi omume,+ onye obi nọ na-agbawa maka ihe ọjọọ ndị na-enweghị ihe ha ji iwu kpọrọ na-eme n’asọghị anya. 8 N’eziokwu, mgbe onye ezi omume a na-ahụ otú ndị o bi n’obodo ha si ebi ndụ jọgburu onwe ya, na-anụkwa ihe ndị ha na-ekwu, obi na-ajọ ya ezigbo njọ kwa ụbọchị.