8 Ugbu a, kpụrụnụ oké ehi asaa na ebule asaa gakwuru ohu m Job, chụọkwanụ àjà a na-esu ọkụ maka mmehie unu. Ohu m Job ga-ekpere unu ekpere.+ M ga-anụ arịrịọ ọ ga-arịọ m ka m ghara ime unu ihe m kwesịrị ime unu maka nzuzu unu zuzuru, n’ihi na unu ekwughị eziokwu banyere m otú ohu m Job kwuru.”