-
Ndị Hibru 11:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ọ bụ okwukwe Ebreham mere o ji fọ obere ka ọ chụọ Aịzik n’àjà mgbe a nwalere ya.+ Nwoke a, onye ji obi ụtọ nabata nkwa ndị e kwere ya, chọrọ iji ọkpara ọ mụrụ naanị ya chụọ àjà,+ 18 n’agbanyeghị na Chineke gwara ya, sị: “Ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.”+ 19 Ma o kwetara na Chineke ga-akpọliteli nwa ya n’ọnwụ, o nwetaghachikwara nwa ya. Ihe a merenụ bụ ihe atụ.+
-