7 Mgbe e mechara, mmụọ ozi Jehova hụrụ Hega n’otu isi iyi dị n’ala ịkpa. Isi iyi ahụ dị n’ụzọ gawara Shọọ.+ 8 O wee sị: “Hega, nwaanyị na-ejere Seraị ozi, olee ebe i si bịa, ebeekwa ka ị na-aga?” O wee zaa, sị: “M si n’ụlọ Seraị nne m ukwu na-agbapụ.”