-
Ọpụpụ 31:2-6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 “Lee, ahọrọla m Bezalel,*+ onye ebo Juda. Ọ bụ nwa Yuraị, nwa nwa Họọ.+ 3 M ga-eme ka mmụọ Chineke jupụta n’ime ya, ka o wee nwee amamihe na nghọta ma mara otú e si arụ ọrụ ọ bụla e ji nkà arụ, 4 ka o nwee ike ise otú ihe dị iche iche a ga-arụ arụ ga-adị, ka o nwee ike iji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa arụ ọrụ, 5 ka o nwee ike ịwa nkume+ na ịkwụnye nkume n’ebe ha ga-adị, na ịrụ ụdị ihe ọ bụla e ji osisi arụ.+ 6 Ahọpụtakwala m Oholiab,+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan ka o nyere ya aka. M ga-emekwa ka ndị niile nwere nkà* nwee amamihe, ka ha wee rụọ ihe niile m nyere gị n’iwu:+
-