18 “Ha ga-ege gị ntị.+ Gị na ndị okenye Izrel ga-agakwuru eze Ijipt, unu ga-agwakwa ya, sị: ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru+ gwara anyị okwu. N’ihi ya, biko, hapụ anyị ka anyị gaa n’ala ịkpa, n’ebe ga-ewe anyị ụbọchị atọ iru, ka anyị chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà.’+