-
Ọpụpụ 10:16-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Fero wee kpọọ Mosis na Erọn ọsọ ọsọ, sị: “Emehiela m Jehova bụ́ Chineke unu, mehiekwa unu. 17 Ugbu a, biko, gbagharanụ m mmehie m naanị otu ugboro a ma rịọsierenụ m Jehova bụ́ Chineke unu arịrịọ ike ka ọ kwụsịrị m nsogbu ọjọọ a.” 18 O* wee hapụ Fero pụọ gaa rịọ Jehova arịrịọ.+ 19 Jehova meziri ka e nwee oké ifufe nke si n’ebe ọdịda anyanwụ. O wee buru igurube ndị ahụ buba n’Oké Osimiri Uhie. Otu mkpụrụ igurube afọghị n’ala Ijipt niile.
-