-
Diuterọnọmi 16:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Kama ọ bụ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya ka unu ga-anọ chụọ ya. Unu ga-achụ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà ná mgbede, ozugbo anyanwụ dara,+ kpọmkwem n’ụbọchị dabara n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta. 7 Unu ga-esi ya, riekwa ya+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ.+ N’ụtụtụ, unu ga-alaghachi n’ụlọikwuu unu.
-