-
Ọpụpụ 5:19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Ndị isi ọrụ ndị Izrel wee hụ na ha nọ ná nnukwu nsogbu n’ihi iwu ahụ e nyere, sị: “Unu esepụla ihe ọ bụla na brik ole unu na-akpụbu kwa ụbọchị.”
-
-
Ọnụ Ọgụgụ 14:2, 3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ndị Izrel niile wee malite ịkatọ* Mosis na Erọn.+ Nzukọ ahụ niile kwukwara okwu ọjọọ banyere ha, sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ n’Ijipt ma ọ bụkwanụ ma a sị na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a. 3 Gịnị mere Jehova ji akpọta anyị n’ala a ka e jiri mma agha gbuo anyị?+ A ga-akpọkọrọ ndị nwunye anyị na ụmụ anyị.+ Ọ́ kaghị mma ka anyị laghachi n’Ijipt?”+
-