-
Ọpụpụ 14:27, 28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ozugbo ahụ, Mosis setịrị aka ya n’elu oké osimiri ahụ. Mgbe chi bọwara, oké osimiri ahụ lọghachiri otú ọ dịbu. Mgbe ndị Ijipt nọ na-agbapụta, Jehova tụbara ndị Ijipt n’etiti oké osimiri ahụ.+ 28 Mmiri ahụ nke na-alọghachi kpuchiri ụgbọ ịnyịnya agha ndị ahụ na ndị agha ịnyịnya nakwa ndị agha Fero niile bụ́ ndị chụụrụ ha banye n’oké osimiri.+ E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ ndụ.+
-